2 Kings 14

Amazaya eze Juda

1Nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoash nwa Jehoahaz nʼIzrel, ka Amazaya nwa Joash eze Juda malitere ọchịchị ya. 2Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ bụ eze na Jerusalem iri afọ abụọ na itoolu. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem. 3O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o meghị dịka nna nna ya bụ Devid mere. Nʼihe niile, ọ gbasoro nzọ ụkwụ nna ya Joash. 4Ọ wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda gara nʼihu na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ahụ niile.

5Mgbe alaeze ahụ siri ike nʼọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya. 6Ma o meghị ka ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ nwụọ, nʼusoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.”

7Amazaya bụ onye gburu puku ndị agha Edọm iri na Ndagwurugwu Nnu, dọtakwa obodo Sela
Aha a na-akpọ Sela nʼasụsụ Griik bụ Petra. Petra bụ isi obodo Idumia.
nʼagha, gụgharịa ya Jekteel, b nke bụ aha a na-akpọ ya ruo ụbọchị taa.

8Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.”

9Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ. 10I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”

11Ma otu ọ dị, Amazaya egeghị ntị. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha, ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda. 12Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya. 13Jehoash bụ eze Izrel nwudere Amazaya bụ eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash gara Jerusalem kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii. 14Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.

15Ihe banyere akụkọ ndị ọzọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha ọ lụrụ megide Amazaya eze Juda, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 16Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

17Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị. 18Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?

19Ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem, ọ gbapụrụ gbalaga Lakish. Ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ. 20Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya na Jerusalem nʼebe e liri ndị nna nna ya ha, nʼobodo Devid.

21Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya. 22Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.

Jeroboam nke abụọ eze Izrel

23Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze. 24Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie. 25Ọ bụ ya weghachitara oke ala Izrel site na Lebo Hamat ruo nʼosimiri Araba, dịka okwu Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Jona nwa Amitai, onye amụma si Gat Hefa.

26 Onyenwe anyị hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị Izrel nọ nʼime ya; onye ọbụla nʼime ha, ohu na onye nwe onwe ya, nọ nʼoke ahụhụ. Ọ dịkwaghị onye inyeaka ọbụla ha nwere. 27Ma ọ bụghị uche Onyenwe anyị ịla Izrel nʼiyi kpamkpam nʼokpuru eluigwe, nʼihi ya ka o mere ka Jeroboam nwa Jehoash napụta ha site nʼaka ndị iro ha.

28Akụkọ niile gbasara ihe niile Jeroboam mere, na ike ya niile, na agha niile o buru, na otu o si nwetaghachiri ndị Izrel obodo Damaskọs na Hamat, bụ obodo ndị Juda, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha? 29Jeroboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ndị eze Izrel nwụrụ anwụ. Ma Zekaraya nwa ya ghọrọ eze Izrel nʼọnọdụ ya.

Copyright information for IboBIU